Lagos–Ibadan Expressway
From Wikipedia, the free encyclopedia
Okporo ụzọ awara awara nke Lagos bụ ụzọ awara awara dị kilomita otu narị na iri abụọ na asaa isi isii (79.3
mi) nke jikọtara Ibadan, isi obodo nke Oyo Steeti na Lagos, obodo kachasị ukwuu na Naịjirịa.[1] Ọ bụkwa ụzọ isi gaa n'ebe ugwu, ndịda na akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Naịjirịa.[2] Okporo ụzọ awara awara bụ nke kachasị ochie na Naịjirịa, nke e nyere iwu n'ọnwa Ọgọọst n'afọ 1978 n'oge ndị agha, n'okpuru nchịkwa nke Major-General Olusegun Obasanjo, onye gbara arụkwaghịm n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba n'afọ 1979, tupu a họpụta ya n'ụbọchị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Mee n'afọ 1999.[3]
Okporo ụzọ awara awara a bụ otu n'ime ụzọ kachasị na Naịjirịa ma na-ejikwa ihe karịrị PCUs narị puku abụọ na iri ise kwa ụbọchị ma bụrụ otu n'etiti netwọk okporo ụzọ kachasị ukwuu n'Afrịka.[4][5] Ọ bụ akụkụ nke ọrụ Federal Roads Maintenance Agency (FERMA), na-echegbu onwe ya maka imeziwanye ụzọ na njikọ dị n'etiti steeti Naịjirịa.