From Wikipedia, the free encyclopedia
Nkwenye-amamihe (nke asụsụ Bekee kpọrọ fịlọsọfị) ndị mbà Chaịna malitere n’oge a kpọrọ “Spring na Autumn period” n’asụsụ Bekee nakwa n’oge mbà na mbà busorịtara onwe ha agha. Aha ọzọ a kpọrọ oge ndịa bụ “Hundred Schools of Thought",[1] mgbe ndị nwere echiche nke ha n’otù n’otù nọ dịka òtù dị otù narị n’ọnụọgụgụ. Oge a bụ oge ihe e jiri mara ya bụ na amamihe na ka-ndị-si-ebi chawapụtara ka kpakpando n’ótuto ha.[1] Na agbanyeghị na nkwenye-amamihe ndị Chaịna malitere n’ogogo dị elu n’oge mbà na mbà busorịtara onwe ha agha, ndị Chaịna enwelaarị nkwenye-amamihe puku afọ olenole bu oge a ụzọ. A ga-ahụ ihe gosịrị nke a n’akwụkwọ kpokọtara ịgba-afa. Akwụkwọ a, a kpọrọ “I Ching” (maọbụ Akwụkwọ Maka Mgbanwe Dịgasịrị) bụ akwụkwọ mgbe ochie, edere tutu a mụọ Jizọs Kraịst.[2]
Ọ bụ n’oge ahụ mbà na mbà busorịtara onwe ha agha ka Sima Tan, nwoke Chaịna akụkọ na ikọwa ka kpakpando si-emetụta mmadụ doro anya, kwuru na òtù atọ a maara aha ha maka nkwenye-amamihe ha dị ichè ichè malitere. Mgbe nkwenye-amamihe atọ a na-aza Konfushanizim, Legalizim na Taghoyizim malitere, e nwekwara nkwenye-amamihe ndị ọzọ malitere ma mechaa danyụọ ka ọkụ. Ha gụnyere nkwenye-amamihe gbasara ọrụ ugbo (a kpọrọ Agrịkọlụchọralizim nke gbasara ihe ekèrè èkè n’ụwa ndị Chaịna (a kpọrọ Chaịniz Nechọralizim, nke ndị na-emekarị mgbakọ na nwepụ (na-aza Ndị Lọjishan nakwa nkwenye-amamihe a kpọrọ Mohizim. Òtù ọ dị, Konfushanizim bụ ya bụ usoro omumeihe a na-ekwe ka ukwe òkwùkwè na mbà Chaịna n’oge ọhụrụ a anyị nọ na ya.[3]
Seamless Wikipedia browsing. On steroids.
Every time you click a link to Wikipedia, Wiktionary or Wikiquote in your browser's search results, it will show the modern Wikiwand interface.
Wikiwand extension is a five stars, simple, with minimum permission required to keep your browsing private, safe and transparent.