![cover image](https://wikiwandv2-19431.kxcdn.com/_next/image?url=https://upload.wikimedia.org/wikipedia/commons/thumb/0/09/DoraAkunyili_Monument_at_Ezinano_Agulu.jpg/640px-DoraAkunyili_Monument_at_Ezinano_Agulu.jpg&w=640&q=50)
Dora Akunyili
onye na-ahu maka mkpuru ogwu na gọọmentị (1954-2014) / From Wikipedia, the free encyclopedia
Dora Nkem Akunyili (A mụrụ ya n'ụbọchị nke iri na anọ n'ọnwa nke asaa n'afọ̀ 1954. Ya anwụọ n'ụbọchị nke asaa n'ọnwa nke isii n'afọ̀ 2014). Ọ bụbu nnukwu onyeisi ntụziaka (nke a na-akpọ daịrekụtọ jenaralụ n'asụsụ Bekee) n'ụlọ-ọru NAFDAC na-ahụ na a na-emepụta nakwa na-ekekesa ọgwụ, ihe ọńụńụ na ihe oriri n'ụdị kwesịrị ekwesị. Akunyili bụkwara mịnịsịta hụrụ maka mgbasa ozi n'ala Naịjiria site na-afọ̀ 2008 ruo 2010. Ọ bụ onye maara ka esi emepụta ọgwụ, onye ndi Bekee na-akpọ famasisiti, nakwa onye ọrụ gọọmentị amà ama na mbà ụwa. O nwetara ọtụtụ onyinye maka ezigbo ọrụ ya site n'aka ndị 'pharmacology', 'public health' na 'human rights' doro anya. [Tinye edensibịa]
ụdịekere | nwanyị ![]() |
---|---|
mba o sị | Naijiria ![]() |
aha n'asụsụ obodo | Nkem ![]() |
Aha enyere | Dora ![]() |
Ụbọchị ọmụmụ ya | 14 Julaị 1954 ![]() |
Ebe ọmụmụ | Makurdi ![]() |
Ụbọchị ọnwụ ya | 7 Jụn 2014 ![]() |
Ebe ọ nwụrụ | Ndia ![]() |
Ụdị ọnwụ | eke na-akpata ![]() |
ihe kpatara ọnwụ | ovarian cancer ![]() |
Ebe olili | Agulu ![]() |
Asụsụ obodo | Asụ̀sụ̀ Ìgbò ![]() |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò ![]() |
Ọrụ ọ na-arụ | pharmacologist, university teacher ![]() |
onye were ọrụ | Mahadum nke Nigeria, National Agency for Food and Drug Administration and Control, Nigerian Federal Ministry of Information and Communications ![]() |
Ọkwá o ji | Minister of Information and Communications, Minister of Information and Communications ![]() |
ebe agụmakwụkwọ | Mahadum nke Nigeria ![]() |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | All Progressives Grand Alliance ![]() |
Ihe nrite | Integrity Award, Order of the Federal Republic ![]() |
Akunyili dọrọ ndọrọ-ndọrọ ịbụ onye omebe iwu dịka sinetọ n'ụlọ ọgbakọ ndị omebe iwu Naịjiria na-anọchite anya andị Anambra Central n'okpuru APGA n'ọnwa nke anọ n'afọ̀ 2011, mana Chris Ngige nke ACN meriri ya. Ozugbo, o zigaara ndị Independent National Electoral Commission akwụkwọ ịgbagha ndapụta ndọrọ-ndọrọ ahụ̀.[1] N'ụbọchị nke asaa nọnwa nke isii n'afọ̀ 2014 ka Akunyili nwụrụ n'ụlọ ọgwụ nọ n'India, site n'ọrìa kansa.[2]