Nwankwo Kanu
Onye otu egwuregwu bọọlụ nke Naijiria / From Wikipedia, the free encyclopedia
Nwankwo Kanu (na-ege ntị) OON (amụrụ n'ụbọchị mbụ n'ọnwa asatọ n'afọ otu puku, nari iteolu na iri asaa n'isii (1, Ọgọstụ1976) bụ onye Naijiria bụbu onye na-agba bọọlụ nke na-agba ọsọ dị ka onye na-aga n'ihu. Ọ bụ onye otu mba Naịjirịa, ma na-egwuri egwu maka ndị otu Naịjirị Iwuanyanwu Nationale, ndị Dutch Ajax, Inter Milan nke Ịtali, na klọb ndị England Arsenal, West Bromwich Albion na Portsmouth.[1]
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
obodo maka egwuregwu | Naijiria |
aha n'asụsụ obodo | Nwankwo Kanu |
Aha enyere | Nwankwo |
aha ezinụlọ ya | Kanu |
Ụbọchị ọmụmụ ya | 1 Ọgọọst 1976 |
Ebe ọmụmụ | Owẹrrẹ |
nwanne | Christopher Kanu |
Dị/nwunye | Amara Kanu Nwankwo |
Asụsụ obodo | Bekee |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee |
Ọrụ ọ na-arụ | Onye otu egwuregwu bọọlụ |
onye were ọrụ | UNICEF |
Ọkwá o ji | UNICEF Goodwill Ambassador |
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụiche | gaa n'ihu |
oge ọrụ ya (mmalite) | 1991 |
Oge ọrụ ya (njedebe) | 2012 |
Ụcha ime anya | agba aja aja |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii |
ụdị egwuregwu | Footbọl |
otu egwuregwu | Premier League |
Ihe nrite | Onye isi ndị Order nke Niger |
Kanu meriri ihe nrite UEFA Champions League, ihe nrite nke UEFA Cup, ihe nrita FA Cup atọ na ihe nrite abụọ nke onye egwu africa nke afo, n'etiti ndị ọzọ. Ọ bụ otu n'ime ndị egwuregwu ole na ole meriri Premier League, FA Cup, Champions League, UEFA Cup na Olympic Gold Medal.[2] O mere nke atọ kachasị dochie anya n'akụkọ ihe mere eme nke Premier League, na-apụta site na bench ugboro otu nari na iri na asatọ (118), a na-ewerekwa ya dị ka otu n'ime ndị egwuregwu kachasị mma n'akụnụ ihe mere eme bọọlụ Afrịka.[3]
Ọ bụkwa onye nnọchi anya UNICEF Mma mma, na onye nnọchianya akara Afrịka maka onye ọrụ igwe onyonyo dijitalụ StarTimes.[4][5] Ọ bụkwa onye nwe igwe onyonyo nke Kanu Sports, ụlọ ọrụ igwe onyonyo egwuregwu Ịntanetị.[6][7]