Osas Ighodaro
From Wikipedia, the free encyclopedia
Osas Ighodaro (onye amụrụ Osariemen Martha Elizabeth Ighodaro ; 26 Ọktoba n'afọ 1983) bụ Nigerian American , onye na-emepụta ihe nkiri, onye na-eme ihe nkiri na onye ọrụ ebere. O meriri na asụm mpi Miss Black USA Pageant n' afọ 2010 ma wee hibe The Joyful Joy Foundation, iji chụ nta ego ma gbasa ozi iji buso oria iba bụ Malaria agha . [1] [2] Na mgbakwunye, ọso nwe mee 2014 Africa Magic Viewers Choice Awards. . Ọ rụrụ ọrụ nke dika Adanna(Danni) n'ihe nkiri Tinsel , wee turu ugo dika onye kacha nwe mee ihe nkiri nke ELOY n'afọ 2014. [3] [4] Osas weputara ihe nkiri Nollywood kacha elu na n'afọ 2018. [5]
Ụlọ ọrụ mmepụta ihe | ụlọ ọrụ ihe nkiri |
---|---|
ụdịekere | nwanyị |
mba o sị | Njikota Obodo Amerika |
aha n'asụsụ obodo | Osas Ighodaro |
Aha ọmụmụ | Osas Ighodaro |
Aha enyere | Osas |
aha ezinụlọ ya | Ighodaro |
Ụbọchị ọmụmụ ya | 26 Ọktoba 1990 |
Ebe ọmụmụ | The Bronx |
Dị/nwunye | Gbenro Ajibade |
Asụsụ obodo | Bekee |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee |
Asụsụ ọ na-ede | Bekee |
Ọrụ ọ na-arụ | omee, onye asọmpi ịma mma, omee ihe nkiri |
ụdị ọrụ ya | theater arts |
ebe agụmakwụkwọ | Pennsylvania State University, Pace University |
Ebe obibi | Lagos |
oge ọrụ ya (mmalite) | 2005 |
Ụcha ime anya | brown |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii |
Ihe nrite | Africa Magic Viewers' Choice Awards, Best of Nollywood Awards, 2016 Nigeria Entertainment Awards, ELOY Awards, Miss Black USA |
webụsaịtị | http://officialosas.com/ |
nnọchiaha nkeonwe | L484 |
A mụrụ Ighodaro na Bronx, dí na New York, United States, nne na nna ya bụ ndị Nigeria si Edo State . O nwetara akara ugo mmụta mbụ ya na mgbasa ozi ma nwekwa mmụta n'agbambọ na Ama egwuregwu na Pennsylvania State University- . Ọ nwetakwara akara ugo mmụta dị elu na ọrụ nka na Actors Studio Drama School at Pace University. Ọ kwagara Naịjirịa n’afọ 2012 ka ọ nanị ọnwa isii tupu Ọ laghachi mba United States; mana o nwetara ọrụ ndị ọzọ, tinyere Tinsel kpatara na Ọ laghachighi kemgbe ahụ. Ọ kwadoro mmemme Maltina Dance All Reality. [6] [7] Ọ bụ onye guzobere Joyful Joy Foundation [8] [9] ma bụrụ kwa onye otu Ụmụ nwanyi Alpha Kappa Alpha .
Ya na Folu Storms sonyeere MTV Shuga maka ihe usoro nkiri nke anọ n'ọnwa nk'iri n'afọ 2019. [10]
Ọ lụrụ Gbenro Ajibade n'ọnwa Juun afọ 2015. [11] Ha mụrụ nwa mbụ ha na afọ 2016. Ha gbara onwe ha alụkwaghịm ozigbo ozigbo [12]