Onye Afrịka-Amerịka na-ese ihe osise From Wikipedia, the free encyclopedia
William H. Simpson (c.1818 1872) bụ ónyé Africa America na-ese ihe na ónyé na-ahụ màkà ikike ọbọdọ na narị afọ nke iri na itoolu, nke a maara màkà foto ya.[1]
A mụrụ William Simpson c.1818 na Buffalo, New York n'ezinụlọ ndị Africa America.[2] Ọ mụtara ihe na onye na-ese foto na ónyé na'ihe osise nke British Neoclassical, Matthew Henry Wilson (1814-1892).[2][3] N'afọ 1854, Simpson kwagara Boston ébé a maara ya màkà ihe osise ya.[2] A maara ya màkà foto ya nke Jermain Wesley Loguen, ónyé bụbu ohu nke ghọrọ bishọp nke African Methodist Episcopal Church na New York.[2] Ihe ndị ọzọ nke ihe osise ya gụnyere Caroline Loguen, nwunye Jermain Loguen; Charles Sumner, ónyé abolitionist na onye ọchịchị; na John T. Hilton, ónyé abolationist, ónyé édémédé, na ónyé ọchụnta ego.[4]
Mgbè 1866 gasịrị, Simpson laghachiri Buffalo, New York, ma biri n'akụkụ ugwu nke United States na Canada.[5] Ọ ghọrọ ónyé na-ekwu okwu megide ịgba ohu ma sonye na Underground Railroad.[5] Ụdị ihe osise ya na ịma mma ya nwèrè mmetụta nke ihe osise Europe, nke bụ ihe a na-ahụkarị n'oge ahụ màkà ndị na-ese ihe America.[5] Otú ọ dị n'adịghị ka ọtụtụ ndị America na-ese ihe n'oge ya, Simpson dere ndụ ndị isi Africa America mbụ.[5]
A na-etinye ọrụ ya na nchịkọta ihe ngosi ọha na eze gụnyere na Howard University Gallery ot Art, na Frick Collection na ọbá akwụkwọ nka.[2][4]
Seamless Wikipedia browsing. On steroids.
Every time you click a link to Wikipedia, Wiktionary or Wikiquote in your browser's search results, it will show the modern Wikiwand interface.
Wikiwand extension is a five stars, simple, with minimum permission required to keep your browsing private, safe and transparent.