Xi Shi
From Wikipedia, the free encyclopedia
Xi Shi ( Hsi Shih nke pụtara (Nwanyị) Shi onye nke Ọdịda Anyanwụ") bụ, dị ka akụkọ mgbe ochie si kwuo, otu n'ime ụmụ nwanyị ama ama dị anọ mara mma nke China oge mgbeochie. Ekwuru na Xi Shi biri n'oge ngwụcha oge opupu ihe ubi na mgbụsị akwụkwọ na obodo Zhuji, isi obodo steeti Yue n'oge ochie.
Akụkụ nke | Four Beauties |
---|---|
ụdịekere | nwanyị |
aha ezinụlọ ya | Shi |
Ụbọchị ọmụmụ ya | 506 BCE |
Ebe ọmụmụ | Zhuji |
Ụbọchị ọnwụ ya | 5. century BCE |
Dị/nwunye | Fuchai |
intangible cultural heritage status | List of Representative Items of National Intangible Cultural Heritage |
WikiProject na-elekọta ya | WikiProject Intangible Cultural Heritage |
N'akụkọ ọdịnala, akpọrọ Xi Shi Shi Shiigu (施 夷 光). [1] Onye minista Yue Fan Li chọtara n'ihi oke mma ya ya wee nye ya Eze Fuchai nke Wu site n'aka eze Goujian nke Yue n'ịrụ ọrụ mmekọ nwoke na nwanyị. Ihe nke a mebiri steeti Wu na afọ 473 BC. Akụkọ kọrọ n'ihi oke mma Xi Shi, Eze Fuchai nke Wu ozugbo enyere ya nwanyị ama ha chefuru na ọ nọ n'agha. Ọwere oge ya niile na elele Xi Shi ma na achọ ụzọ ime ya obi ụtọ. Akụkọ nke a pụtara na mbụ n'akwụkwọ opupu ihe ubi na mgbụsị akwụkwọ nke Wu na Yue (nke akpọrọ Spring and Autumn Annals of Wu and Yue n'asụsụ Bekee) nke ebipụtara n'narị afọ ise mgbe mmeri ahụ enwechara gachara, ma na ọ nọghị na ọrụ ndị mbụ dịka Guoyu, Zuo zhuan, na Records of the Grand Historian . [2]
A maara Xi Shi, Wang Zhaojun, Diao Chan na Yang Guifei dị ka "ụmụ mma anọ na China oge ochie", nke Xi Shi bụ onye mbụ. Akụkọ kwuru na ụmụ nwanyị ndị biri ndu n'oge dị iche iche mana oke mma ha mere ka a na akokọta akụkọ ha ọnụ. [3]