Annie Macaulay-Idibia
Onye na-eme ihe nkiri Naijiria, onye nlereanya na onye ngosi From Wikipedia, the free encyclopedia
Remove ads
Afọ ọmụmụ - Amụrụ Annie Macaulay-Idibia ⓘ n'abalị iri na atọ nke onwa novemba n'afọ 1984 (afo iri atọ na ise )
Ibadan, Oyo steetị, Naijiria.
Nwamaala - Nigerian
Akaọrụ - Onye na-eme ihe nkiri(omee), onye nlereanya, onye na-eme ihe nchikọta.
Afọ n'ọrụ - 2009-ugbu a
Dị - Innocent Idibia
.
Annie Macaulay – Idibia (amụrụ n'ubọchị iri na atọ n'onwa novemba n'afọ 1984) bụ onye Naijiria, onye nlereanya,onye na-eme ihe nchikota na onye na-eme ihe nkiri.[1][2] A họpụtara ya na ụdị "Onye na-akwado ihe nkiri kachasị mma" (Best Supporting Actress) na <a href="https://en.wikipedia.org/wiki/2009_Best_of_Nollywood_Awards" rel="mw:ExtLink" title="2009 Best of Nollywood Awards" class="cx-link" data-linkid="45"> 2009 Best of Nollywood Awards </a>.
Remove ads
Mmalite ndụ na mmụta
Amụrụ Annie na Ibadan mana ọ bụ onye Eket na steeti Akwa Ibom. Ya na nne ya kwagara na Lagos mgbe nne na nna ya gbara alụkwaghim. O nwere akara mmụta na Computer Science na Theatre Arts mgbe ọ gụsiri akwụkwọ na Lagos State University na University of Lagos n'otu n'otu.[3]
Ọrụ
Tupu Annie Macaulay – Idibia a malite ọrụ ime ihe nkiri ya, ọ sọrọ mpi n'egwuregwu "Queen of All Nations Beauty Pageant" ebe ọ bụ osote onye mbụ. O bụkwa onye egosiri na mbido vidiyo egwu nke 2face idibia akpọrọ "African Queen ".[3]
Ọrụ ya na Nollywood pụtara ihè maka ọrụ ya na ihe nkiri akpọrọ Pleasure and Crime na Blackberry Babes .
Ihe nkiri ahọputara
- First Family
- Pleasure and Crime
- White Chapel
- Blackberry Babes
- Return of Blackberry Babes
- Estate Runs
- Unconditional[4]
- Obiageli The Sex Machine
- Morning After Dark
- Beautiful Moster
Ndụ onwe
Annie Macaulay – Idibia lụrụ 2face Idibia , nke ya na ya nwere ụmụ abuọ. Ọ mụrụ nwa nke mbụ ya, nwa nwaanyị aha ya bu Isabella Idibia n'onwa Disemba n'afọ 2008 na nwa nke abụọ ya bụ Olivia Idibia n'ụbọchị atọ nke onwa Jenụwari n'afọ 2014. O nwekwara ụlọ ọrụ ebe a na-achọ mma (beauty salon) na Atlanta a na-akpọ "BeOlive Hair Studio".
Onyinye na nhoputa
Ebe nsi nweta
Wikiwand - on
Seamless Wikipedia browsing. On steroids.
Remove ads