Betty Anyanwu-Akeredolu
onye na-akwado Naijiria, ọkachamara n'ịkụ azụ, na First Lady nke Ondo State From Wikipedia, the free encyclopedia
Remove ads
Betty Anyanwu-Akeredolu (a mụrụ n'afọ 1953) bu akwakọlchọristị, onye na-enyere ndi mmadu aka, ma burukwa nwunye onye isi ala nke Ondo Steeti na Naijiria. Ọ lụrụ gọvanọ bụ Oluwarotimi Odunayo Akeredolu . [1] O bu onye hiwere Breast Cancer Association nke Naijiria. [2]
Betty Anyanwu-Akeredolu
Remove ads
Omumu na mmuta
A mụrụ Betty Anyanwu- Akeredolu n'ụbọchị nke 20 n'ọnwa Julaị n'afọ 1953, na ezi na ulo nke onye isi BUB na Nneoma Dora Anyanwu, na Emeabiam, nke Owerri-West, na Imo Steeti . [3] Anyanwu-Akeredolu gara Mahadum nke Naijiria,dị na Nsukka ebe ọ nwetara nzere bachelọ nke sayensị na zuuọlọji n'afọ 1977. O nwere akara nzere masta na sayensị nke azụ, nke isi agụmagụ ya bụ akwakọlchọristị, na Mahadum nke Philippines dị na Visayas n'obodo Iloilo . [4]
Remove ads
Ọrụ
Ọ malitere ọrụ ya dị ka ọkachamara n'ịkụ azụ mgbe ọ na-arụ ọrụ na Ngalaba Na-ahụ Maka Azụ n'ogo gọọmentị etiti. Ọ lara ezumike nká n'afọ 2005. [5] [6] Ọ bu onye na-azu ahia azụ ma na enyekwa ndumodu site na ulo oru ya, Aquatek Farms Ventures. [7] Na mgbakwunye, ọ banyela na ndọrọ ndọrọ ọchịchị kemgbe afọ 2007 ma na-arụsi ọrụ ike n'oge a (2017). [8]
Afọ ọma na inyere ndi mmadu aka
N’afọ 1997, a chọpụtara na ọ na-arịa kansa ara. Ọ gara nlekọta ma gbakee. Ọ malitere otu ụlọ ọrụ bụ ndị ọrụ ebere, Breast Cancer Association of Nigeria (BRECAN) [9] iji mee ka a mata banyere ọrịa a. O ritela ugo na ntunye ọrụ ya na mbọ ọ na-agba i buso ọrịa kansa aha na Naịjirịa. [6]
Ọ bụkwa onye nkwado nke otu ‘Bring Back Our Girls’. [10]
Ndụ onwe ya
Ọ lụrụ Oluwarotimi Odunayo Akeredolu, SAN . [10] [6] Ha nwere ụmụ anọ na ụmụ ụmụ anọ.
Ebe m si dee
Wikiwand - on
Seamless Wikipedia browsing. On steroids.
Remove ads