Omah Lay
Onye egwu Nigeria From Wikipedia, the free encyclopedia
Remove ads
Omah Lay, onye ezigbo aha ya bụ Stanley Omah Didia bụ onye na-agụ egwu, na-ede abụ, na-arụkwa ụda egwu. A mụrụ ya na Mee 19 1997. Ọ ghọrọ onye ama ama na 2020 mgbe egwu izizi ya “YOU” gbasara ngwa ngwa na ịntanetị. Ọ malitere dị ka onye na-emepụta egwu na onye na-ede egwú na Port Harcourt mana ọ mecha kpebie ịmalite ịgụ egwu mgbe ọ ghọtara na ya enwetaghị otuto zuru oke maka egwu ndị o nyere ndi ozo aka mepụta. Ọ mepụtara ma wepụta egwu dị ka "Do Not Disturb" na "Hello Brother" na obodo ya Port Harcourt nke meghere ya ụzọ ka ọ wee banye KeyQaad.[1]

Remove ads
Ndụ ya
A mụrụ Omah Lay na Port Harcourt nime Southern Nigeria. Ọ tolitere na agbata obi nke Marine Base. Omah Lay agaghị abụ onye mbụ na-eme egwu na ezinụlọ ya. Nna nna ya bụ onye n'eti igba nke onye egwu Highlife nke nwụrụ anwụ, bụ Celestine Ukwu.[2]
Ọrụ egwu ya
Omah Lay banyere n'egwú dị ka onye rapper na agbata obi Marine Base. Aha ọkwa ya n’oge ahụ bụ Lil King. O mechara kpebie ịmụ otú e si emepụta egwú. O bu ụzọ gosi akara ya na egwu mgbe o mepụtara ọtụtụ egwu ndị wuru ewu na redio. Na May 22, Omah Lay wepụtara EP mbụ ya 'Get Layd' nke nwere egwu dịka “You” na “Bad Influence”.[3] EP ya rere nke ọma na ahịa. Ọ ghọrọ otu n'ime oba egwu Afrobeat kacha mma na ịntanetị wee gaa n'ihu ime Omah Lay Apple Music Favorite New Artiste nke ọnwa June na Africa.[4]
Na Septemba 2020, Omah Lay pụtara na egwu DJ Tunez "Pami" n'akụkụ Wizkid na Adekunle Gold.[5] N'otu ọnwa ahụ, Ọ weputara vidiyo egwu ya bụ “Damn”.[6]
Remove ads
Zoro aka
Wikiwand - on
Seamless Wikipedia browsing. On steroids.
Remove ads